Zahra' Langhi

Zahra' Langhi
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịLibya Dezie
aha n'asụsụ obodoزهراء لنقي Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya28 Jenụwarị 1975 Dezie
Asụsụ obodoArabic Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye na-akwado ikike mmadụ, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie

Zahra' Langhi (Arabic) bụ onye na-ahụ maka ụmụ nwanyị, onye Libya a chụgara mba ọzọ, onye na-agbachitere ikike mmadụ, onye n'ahụ maka udo, na ọkachamara na okike, ngwọta esemokwu, na iwube udo.

Ọ bụ ọkachamara na mgbochi ime ihe ike, udo na nchekwa ụmụ nwanyị, na ogbugbo na mkparịta ụka mba. Nnyocha ya na-ejikọta nhata nwoke,nwanyị na akụkọ ihe mere eme nke Islam, metaphysics, mysticism, na ime mmụọ nwanyị site na nkwenye nkwekonu.

Langhi bụkwa onye nchoputa na onye isi oche nke Libyan Women's Platform for Peace (LWPP), otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-elekwasị anya n'iwu udo, njikọta na nhata nwoke na nwanyị.

Ọrụ Langhi enwetawo nkwado mba ụwa site na Rockefeller Foundation, Helen Clark, na Charter of compassion nke Karen Armstrong duziri.

Oge ọ malitere

Ezinụlọ ya gbapụrụ Libya na afọ puku na nari iteghete na iri asaa na asatọ mgbe ọ dị afọ atọ gaa London. Ha mechara kwaga Cairo. Langhi na-eto nchụpụ maka itolite na mmetụta siri ike nke mba. Ihe mgbagwoju anya ahụ bụ ihe na-akọwa: ọ bụ onye Libya na onye mba ya na-amaghị. "Mgbe ụfọdụ, ndị Libya nọ n'ebe a chụgara ha na-achọsi ike ịbụ ndị ọdịnala karịa ndị Libya nọ na mba ahụ". ..."Libya bụ ụlọ anyị; ọ dị na nri anyị na ihe na-esi ísì ụtọ anyị".

Libya nke oge a enweghị ike ikewapụ ya na ihe nketa Langhi. Nna nna ya, Yusuf Langhi, bụ onye dị mkpa n' òtù mmegide ndị Itali, nke mere ka ndị Fascist Itali chụpụ ya. O mechara kwadọ ndị nnọchi anya Libya mbụ na UN (Ndị nnọchi anya Cyrnica) iji kwurịta maka nnwere onwe Libya na afọ puku na narị iteghete na iri abụọ na iteghete. Mgbe Libya nwetara nnwere onwe ya na afọ puku na nari iteghete na iri ise na otu, Yusuf Langhi ghọrọ onye isi obodo mbụ nke Benghazi na onye òtù Congress. A họpụtara nna ya, Ahmad Langhi, onye na-emegide ọchịchị Qaddafi ogologo oge mgbe mgbanwe ahụ gasịrị na puku abuọ na iri abuọ dị ka onye otu National Congress mbụ a họpụtara na Libya n'ime afọ iri ise na abuọ na puku abou na iri na isii dị ka onye so na High State Council.

Mgbe afọ iri atọ na atọ gasịrị, Langhi laghachiri ịrụ ọrụ dị mkpa na nnwere onwe Libya, n'oge a site na Gaddafi. O bu ụzọ gaa Tripoli, isi obodo, na Nọvemba puku abuọ na iri na otu iji gaa nzukọ ya na Libyan Women's Platform for Peace (LWPP), netwọk ọ kwadoro naanị otu ọnwa tupu. Ebumnuche nke LWPP bụ iji hụ na ụmụ nwanyị sonyere na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Libya mgbe Gaddafi gasịrị.

Ọrụ

N' afọ 2011, Langhi guzobere Libyan Women's Platform for Peace (LWPP), ya na ụmụ nwanyị iri ato na ise na-achi ha na Libya, ọ bụkwa onye nduzi nke nzukọ ahụ. Ọ hazikwara mmemme Libyan Women's Political Empowerment (LWPE), ya na UNWomen na Karama.

N' afọ 2012, Langhi nyere okwu TED nke akpọrọ "Ihe mere mgbanwe Libya ji daa na ihe nwere ike ịrụ ọrụ" ma soro mepụta ma kwado 'Libya Speaks', ihe ngosi onyonyo a raara nye ihe ịma aka nke mgbanwe ọchịchị onye kwuo uche ya na Libya. Langhi kwuru na mgbe ọ hụrụ ihe mgbasa ozi mmekọrịta nwere ike ime na Egypt, o kpebiri ịkpọ oku maka "ụbọchị iwe" site na iji Facebook na Libya, mana ugbu a ọ na-akwa ụta maka nke a, na-ekwu na ọ kwesịrị ịkpọ oku maka ""ụbọchị na abalị ọmịiko". O kwuru na iwe ezughị iji weta ezigbo mgbanwe, nakwa na inweta ikpe ziri ezi na ùgwù chọrọ ọmịiko.

Site na LWPP, Langhi chịrị mkpọsa nkwado maka mgbanwe usoro ntuli aka na Libya ma hazie nzukọ mbụ n'etiti ndị na-eme ngagharị iwe, ndị isi mgbanwe, ndị ọrụ nchekwa na ndị ọrụ nzuzo, na ndị omeiwu na DDR na SSR. Langhi duziri atụmatụ LWPP nke ịmanye iwebata ndepụta zipper (mgbanwe nke ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị na pati ndọrọ ndọrọ ọchịchị) na iwu ntuli aka, nke nwetara 17.5 nke oche na National Congress.

Site na 2016 ruo 2018, Langhi malitere mmekọrịta abụọ na ụlọ ọrụ okpukpe Alakụba abụọ kachasị ochie, Mahadum Es-Zitouna na Al-Azhar, na mgbalị iji kpọkọta ndị obodo na ndị isi okpukpe si North Africa na Sahel iji kwurịta mbọ ndị na-eme ka mmadụ nwee ike imegide oke na ikike mmadụ.

Langhi enyela aka nke ukwuu na nyocha na akwụkwọ gbasara mgbanwe Libya. N'afọ 2017, Langhi sonyere na mkparịta ụka udo / mkparịta ụka UN Led na track nke ndị isi ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị na-eme ngagharị iwe. Tụkwasị na nke a, ya na United States Institute of Peace, ọ duziri ọrụ nyocha nke gosipụtara ngalaba okpukpe nke Libya dị ka ụzọ isi ghọta ọrụ ndị na-eme ihe nkiri okpukpe na-arụ ugbu a na nke nwere ike ịrụ na ime udo na imegide ime ihe ike. N'afọ 2016, ọ duziri ọrụ nyocha gbasara isi obodo na iwu mba na Libya dị ka akụkụ nke usoro 'A Vision of Sustainable Peace'. Zahra' bụkwa onye dere ọtụtụ isiokwu gbasara mgbanwe Libya.

Langhi bụ onye otu IFIT Inclusive Transitions Practice Group. IFIT Inclusive Transitions Practice Group bụ ọrụ ndụmọdụ mbụ n'ụwa na nhọrọ dị iche iche nke nwere ike iweta mkparịta ụka na mgbanwe na ọha mmadụ na-adịghị ike na nke esemokwu. N'ịbụ nke nwere njikọta nke ndị ọkachamara ahọpụtara ahọpụtara na mpaghara ndị dị ka nyocha ndọrọ ndọrọ ọchịchị na akụ na ụba, ntọala ndọrọ ndọrọ ọchịchị, akụ na ụba.

Langhi bụ onye ndụmọdụ na Libyan National Dialogue . Ya na Lord Alderdice, Langhi so bụrụ onye isi oche nke The Hammamet Conference Series, ikpo okwu mba ụwa maka mkparịta ụka na ọganihu na mmekọrịta dị n'etiti UK na North Africa.

N'afọ 2018, Langhi sonyeere UN- ESCWA (Economic Social Commission for West Asia). Ọfịs ya bụ ụmụ nwanyị, udo na nchekwa na mgbochi nke ime ihe ike.

Maka Ụbọchị Ụmụ nwanyị Mba Nile, na ụbọchị asaa n' ọnwa Machị 2014, The Guardian gwara Helen Clark, onye isi nke United Nations Development Programme (UNDP), na onye bụbu praịm minista nke New Zealand, ka ọ họrọ "Ndị inyom asaa ka ha lelee na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa", Langhi bụkwa otu n'ime ndị a họọrọ.

N' afọ puku abụọ na iri na isii,Salt Magazine weputara Zahra' nke iri abụọ na isii na ndepụta nke ụmụ nwanyị nari na-akpali akpali na-arụ ọrụ maka inye ụmụ nwanyị ike na iwu udo.

N 'afọ puku abụọ na iri na isii,a kpọrọ Zahra Langhi otu n'ime ụmụ nwanyị iri abụọ na atọ na-akpali akpali na-alụ ọgụ maka ụmụ nwanyị site na Charter of compassion nke onye ọkà mmụta agụmakwụkwọ Karen Armstrong duziri.

N'afọ 2018, The Rockefeller Foundation kpọrọ Zahra otu n'ime ndị isi nwanyị ise na-ewebata mgbanwe mgbanwe gburugburu ụwa.

Langhi bụ onye na-achọ PhD na-ahụ maka okpukpe, ime ihe ike, na ime udo na Mahadum Friedrich Schiller na Jena. O nwere MA na akụkọ ihe mere eme nke Islam na Mahadum America dị na Cairo.

  1. 1.0 1.1 Building a Just Future: Leadership for Gender Parity (en-US). The Rockefeller Foundation (2018-03-07). Retrieved on 2019-08-17.
  2. 2.0 2.1 Clark (7 March 2014). Seven women to watch in global politics. www.theguardian.com. Retrieved on 6 November 2017.
  3. 3.0 3.1 Hicklin. 23 Inspiring Women Fighting For Women (en-gb). charterforcompassion.org. Archived from the original on 2019-08-17. Retrieved on 2019-08-17.
  4. 4.0 4.1 We Have to Struggle for a Better Libya (en). libya.zenith.me (2017-10-12). Retrieved on 2019-08-17.
  5. 5.0 5.1 Zahra' Langhi - Global Philanthropy Forum. philanthropyforum.org. Archived from the original on 7 November 2017. Retrieved on 6 November 2017.
  6. 6.0 6.1 Zahra' Langhi. openDemocracy. Archived from the original on 7 November 2017. Retrieved on 6 November 2017.
  7. 7.0 7.1 7.2 Karama (8 April 2016). Zahra' Langhi, Co-founder and Director of the Libyan Women's Platform for Peace. medium.com. Retrieved on 6 November 2017.
  8. Langhi. Zahra' Langhi | Speaker | TED (en). www.ted.com. Retrieved on 2019-08-17.
  9. Zahra' Langhi (en-GB). Karama. Retrieved on 2019-08-17.
  10. Langhi. Zahra' Langhi | Speaker | TED (en). www.ted.com. Retrieved on 2019-08-20.
  11. 11.0 11.1 11.2 11.3 Zahra' Langhi — IFIT - Institute for Integrated Transitions. www.ifit-transitions.org. Archived from the original on 2019-08-17. Retrieved on 2019-08-17.
  12. North Africa – UK leadership conference looks at solutions to building peaceful and inclusive societies | British Council (en). www.britishcouncil.tn. Retrieved on 2019-08-17.
  13. Salt. 23 Inspiring Women Fighting For Women | Salt (en-US). Archived from the original on 2019-08-17. Retrieved on 2019-08-17.